Job 13

1“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,
ntị m anụla ma ghọtakwa ha.
2Mụ onwe m makwa ihe unu maara;
abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.
3Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,
ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.
4Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;
unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.
5Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,
nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.
6Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;
geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.
7Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?
Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?
8Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?
Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?
9Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu?
Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?
10Ọ ghaghị ịbara unu mba
ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.
11Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji?
Egwu ya ọ dịghị atụ unu?
12Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ;
okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.

13“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu;
ihe ọ pụtara ya pụta.
14Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu,
werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?
15A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m.
Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.
16Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta
maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.
17Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m.
Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.
18Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro,
amatala m na ikpe agaghị ama m.
19Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo a?
Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.

20“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke,
mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.
21Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ.
Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.
22Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị.
Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.
23Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?
Gosi m ajọ omume m na mmehie m.
24Gịnị mere i ji gbakụta m azụ? b
Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?
25Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?
Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?
26Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,
na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.
27Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;
na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile
site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.

28“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere,
na dịka akwa nke nla riri.
Copyright information for IboBIU